Published 2024-09-24
Keywords
- Nsiniwu,
- Mbamuru,
- Omenala,
- Ngụmaha,
- Akparamagwa
How to Cite
Abstract
Nsiniwu na mbamuru bụ ihe ezumezu obodo ọ bụla na-agba mbọ ime ka ụmụ amaala obodo ha mara, mụta ma debe. Ndị Igbo dịka
otu agbụrụ ukwu nọ na Naịjịrịa nwere omenala dị iche iche nke ngụmaha bụ otu n'ime ha. Nsogbu nchọcha a bụ na akparamagwa na
omume ọtụtụ mmadụ taa n’ala Igbo bụ nke juputara na mpụ na ọchụ dị iche iche nke na-eziputa na ndị mmadụ ka nwere nsọpụrụ
n’ebe ego na akụnaụba dị karịa ezi aha. Nchọcha a gbadoro ụkwụ n'iwepụta aha ndị ahụ ndị Igbo na-agụ ụmụ ha iji kuziere ha
nsiniwu na mbamuru. Elebagharịrị anya n'ihe ndị e derela banyere ngụmaha nakwa nsiniwu na mbamuru, ebe e jiri atụtụ nchọcha
ndịnọrụ mee nchọcha. Uru nchọcha a bara bụ na ọ ga-enyere ụmụ akwụkwọ na ọha mmadụ ndị ọzọ aka ịmata na aha ọbula e nyere
mmadụ nwere ebe ohiwere isi. Ọ ga-enyekwara ụmụ akwụkwọ aka ime nnyocha maka aha n'ọdịnihu. Ndịnchọcha nwere ndị ha
gbara ajụjụ ọnụ iji nweta aha dị iche iche na mpụtara ha. N'ikpeazụ, e wepụtara aha dị iche iche ndị ahụ ndị Igbo ji akụzi nsiniwu na
mbamuru, ebe ntụpụta aro na nchịkọta mechiri ya.